2
 1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, 
guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. 
Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, 
na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a. 
Ọsịsa Onyenwe anyị 
 2 Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, 
“Dee ọhụ* 2:2 Ya bụ, ọsịsa ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. 
Depụta ya nke ọma, 
ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 
 3 Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, 
ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, 
Ọ gaghị abụkwa ụgha. 
Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, 
nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, 
ọ gaghị anọ tee aka. 
 4 “Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; 
ọchịchọ ya ezikwaghị ezi 
ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe† 2:4 Maọbụ, ikwesi ntụkwasị obi ya dị ndụ. 
 5 Nʼezie, mmanya‡ 2:5 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ihe ị ga-ahụ bụ akụnụba. na-eduhie ya ụzọ, 
onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. 
Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, 
ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. 
Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, 
ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. 
 6 “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, 
“ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, 
ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya 
site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’ 
 7 Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? 
Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? 
Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. 
 8 Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche, 
ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere. 
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ, 
i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha. 
 9 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, 
nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, 
nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa. 
 10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, 
sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere. 
 11 Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. 
Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ. 
 12 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, 
nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. 
 13 Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, 
na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, 
na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi? 
 14 Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, 
dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 
 15 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, 
nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, 
ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. 
 16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. 
Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. 
Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. 
Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. 
 17 Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. 
Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. 
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, 
bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. 
 18 “Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? 
Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? 
Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, 
nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere. 
 19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ 
Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ 
O nwere ike izi mmadụ ihe? 
Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, 
ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.” 
 20 Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. 
Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.