2
Nzube mmadụ na nzube Chineke 
 1 Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha, 
na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche. 
Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara, 
nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha. 
 2 Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, 
na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. 
Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, 
ha na-ezunara ha ihe nketa ha. 
 3 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, 
“Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, 
nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. 
Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, 
nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ. 
 4 Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, 
ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, 
‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, 
e kesaala ihe nnweta nke ndị m, 
ọ napụla m ha. 
O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ” 
 5 Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, 
onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza. 
Ndị amụma ụgha 
 6 Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” 
“Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, 
ihere agaghị eme anyị.” 
 7 Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? 
“Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? 
Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” 
“Ọ bụ na okwu m adịghị eme 
onye ụzọ ya ziri ezi mma? 
 8 Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m 
dịka ndị iro. 
Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe 
uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, 
dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta. 
 9 Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m 
site nʼụlọ afọ ojuju ha. 
Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m 
ruo mgbe ebighị ebi. 
 10 Bilienụ, pụọnụ, 
nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, 
nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, 
o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire. 
 11 Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, 
‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ 
ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ. 
Nkwa nzọpụta 
 12 “Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, 
aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. 
Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, 
dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, 
ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ. 
 13 Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. 
Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. 
Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, 
Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”