Ọbadaya  
 1
Ọhụ Ọbadaya 
 1 Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. 
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. 
Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, 
e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, 
“Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.” 
 2 “Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; 
ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu. 
 3 Nganga nke obi gị eduhiela gị, 
gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, 
onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. 
Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, 
‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’ 
 4 A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, 
ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, 
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
 5 “Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, 
e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, 
lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! 
Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? 
Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, 
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? 
 6 Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, 
lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo! 
 7 Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, 
ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; 
ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, 
ma ị gaghị achọpụta ya. 
 8 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, 
“ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, 
bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ? 
 9 Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. 
Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, 
ka a ga-egbuda nʼagha. 
 10 Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. 
Ihere ga-ekpuchi gị; 
a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 
 11 Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, 
na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, 
sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee 
fee nza iji kerie Jerusalem. 
Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha. 
 12 Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya 
nʼụbọchị nsogbu ya, 
ị garaghị aṅụ ndị Juda 
nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. 
Ị garaghị anyara ha isi 
nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu. 
 13 I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije 
nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, 
o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, 
nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, 
maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha 
nʼụbọchị nsogbu ha. 
 14 I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ 
igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, 
maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, 
nʼụbọchị nsogbu ha. 
 15 “Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso 
nye mba niile. 
Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; 
ihe i metara ga-adị gị nʼisi. 
 16 Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ 
otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. 
Ha ga-aṅụ, ṅụọ, 
ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ. 
 17 Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, 
ọ ga-adị nsọ, 
ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ. 
 18 Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, 
ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: 
ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. 
Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. 
Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ 
site nʼụlọ Ịsọ.” 
Onyenwe anyị ekwuola ya. 
 19 Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi 
nʼugwu ugwu Ịsọ, 
ndị si na Shefela* 1:19 Ndị a bi nʼebe ala ala ugwu 
ga-enwekọta ala ndị Filistia. 
Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. 
Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead. 
 20 Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala, 
ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat. 
Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad, 
ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb. 
 21 Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn 
maka ịchị ugwu Ịsọ niile. 
Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.