6
Ịdọ aka na ntị banyere nzuzu 
 1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, 
ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, 
 2 ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, 
onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. 
 3 Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; 
nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: 
Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya 
enyekwala ya izuike ọbụla. 
 4 Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, 
ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. 
 5 Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, 
maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya. 
 6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. 
Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. 
 7 Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, 
maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, 
 8 ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị 
ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi. 
 9 Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? 
Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? 
 10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, 
nwa ịchịkọba aka nta zuo ike, 
 11 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, 
ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe. 
 12 Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, 
onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ, 
 13 onye ji iro na-egbu ikuanya ya, 
jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu 
na mkpịsịaka ya na-egosi ihe. 
 14 Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, 
onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile. 
 15 Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; 
nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya. 
 16 Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, 
e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. 
 17 Anya dị nganga, 
ire na-ekwu okwu ụgha, 
aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ. 
 18 Obi na-echepụta nzube ọjọọ; 
ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe, 
 19 onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri 
na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna. 
Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko 
 20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, 
ahapụkwala iwu nke nne gị.* 6:20  Efe 6:1 
 21 Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, 
ka ị ghara ichefu ha. 
 22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; 
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. 
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka. 
 23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna,† 6:23  Abụ 119:105 
Ihe ozizi a bụkwa ìhè,‡ 6:23  Abụ 19:8; 2Pt 1:19 
otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba 
bụ ụzọ ezi ndụ, 
 24 idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, 
sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. 
 25 Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, 
ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. 
 26 Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, 
ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi. 
 27 Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, 
ma uwe ya ereghị ọkụ? 
 28 Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ 
ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ? 
 29 Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; 
o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ. 
 30 Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi 
ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike. 
 31 Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. 
Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya. 
 32 Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, 
nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi. 
 33 A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, 
ihere ya agaghị ekwe ihichapụ. 
 34 Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; 
ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ. 
 35 Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. 
O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.