8
Ọkpụkpọ oku amamihe na-akpọ 
 1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? 
Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda? 
 2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, 
nʼagbata ụzọ niile. 
 3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile 
na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu, 
 4 ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; 
ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu. 
 5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; 
unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta. 
 6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; 
Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi, 
 7 Ọnụ m na-ekwu eziokwu 
nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị. 
 8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. 
Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya. 
 9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; 
nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi. 
 10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha 
họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.” 
 11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. 
Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya. 
 12 “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. 
Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu. 
 13 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. 
Akpọrọ m nganga na mpako, 
omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị. 
 14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; 
enwekwara m ọmụma ihe na ike. 
 15 Site na m ka ndị eze ji achị, 
ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. 
 16 Site na m ka ndị eze ji achị 
bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa. 
 17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. 
Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m. 
 18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, 
na ikpe ziri ezi na ezi omume. 
 19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, 
ọ karịkwara ọlaedo. 
 20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, 
nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. 
 21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. 
Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha. 
 22 “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, 
tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. 
 23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; 
adịkwa m adị tupu e kee ụwa. 
 24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, 
tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, 
 25 tupu e kee ugwu ukwu 
na ugwu nta. 
 26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa 
na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. 
 27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, 
mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; 
 28 mgbe o hiwere mbara eluigwe, 
mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, 
 29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, 
ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, 
mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. 
 30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. 
Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; 
ana m egwuri egwu nʼihu ya. 
 31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, 
ụwa niile na ụmụ mmadụ! 
 32 “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; 
nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ. 
 33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, 
agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ. 
 34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, 
onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, 
onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m; 
 35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; 
ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ. 
 36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; 
ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”