14
 1 Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, 
ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. 
 2 Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; 
ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. 
 3 Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, 
ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. 
 4 Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, 
ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. 
 5 Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, 
ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. 
 6 Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; 
ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ. 
 7 Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, 
nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya. 
 8 Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, 
ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. 
 9 Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; 
ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 
 10 Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, 
ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 
 11 A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, 
ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 
 12 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, 
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 
 13 Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, 
ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. 
 14 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, 
ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. 
 15 Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; 
ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. 
 16 Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, 
ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 
 17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, 
ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. 
 18 Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, 
ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma. 
 19 Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, 
ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. 
 20 Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, 
ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. 
 21 Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, 
ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. 
 22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? 
Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 
 23 Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; 
ma oke okwu na-eweta ụkpa. 
 24 Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, 
ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 
 25 Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, 
ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 
 26 Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; 
nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. 
 27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; 
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 
 28 Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, 
e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. 
 29 Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, 
ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. 
 30 Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; 
ekworo na-eme ka o ree ure. 
 31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, 
ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. 
 32 Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, 
ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. 
 33 Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, 
ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya. 
 34 Ezi omume na-ewuli mba elu, 
ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla. 
 35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; 
ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.