22
 1 Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, 
ịnata amara* 22:1 Maọbụ, mmadụ inwe ugwu ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo. 
 2 Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị 
onye kere ha niile. 
 3 Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, 
ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya. 
 4 Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, 
ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo. 
 5 Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; 
ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ. 
 6 Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,† 22:6  Efe 6:4; 2Tm 3:15 
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya. 
 7 Dịka ọgaranya si achị ogbenye, 
otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego. 
 8 Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, 
mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa. 
 9 Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, 
nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri. 
 10 Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, 
e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa. 
 11 Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, 
onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze. 
 12 Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, 
ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ. 
 13 Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! 
A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!” 
 14 Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, 
nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya. 
 15 Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, 
ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya. 
 16 Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, 
maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ. 
Okwu iri atọ onye maara ihe 
Okwu nke mbụ 
 17 Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, 
tinye uche gị nʼihe m na-akụzi. 
 18 Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, 
ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile. 
 19 Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, 
ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị. 
 20 Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, 
bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma? 
 21 Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. 
Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu 
ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi. 
Okwu nke abụọ 
 22 Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. 
Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe. 
 23 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha 
ma bibiekwa ndị na-emegide ha. 
Okwu nke atọ 
 24 Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, 
gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe, 
 25 ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, 
si otu a tinye ndụ gị na nsogbu. 
Okwu nke anọ 
 26 Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe 
maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji. 
 27 Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, 
a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị. 
Okwu nke ise 
 28 Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. 
Nke ndị nna ochie gị ha hiwere. 
Okwu nke isii 
 29 Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? 
Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, 
ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.