Abụ Ọma 150
Ka ihe niile too Onyenwe anyị 
 1 Toonu Onyenwe anyị. 
Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. 
Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. 
 2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. 
Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. 
 3 Werenụ opi ike too ya, 
werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, 
 4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, 
jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, 
 5 werenụ ogene too ya, 
werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. 
 6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. 
Toonu Onyenwe anyị.* 150:6 Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.
*Abụ Ọma 150:6 150:6 Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.