2
E kpere Juda na Jerusalem ikpe ha na mba niile 
Oku akpọrọ Juda ka ọ chegharịa 
 1 Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, 
unu ndị mba ihe ihere dịrị. 
 2 Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, 
a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, 
tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị 
abịakwasị gị, 
tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị 
abịakwasị gị. 
 3 Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, 
unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. 
Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, 
ma eleghị anya, a ga-echebe unu 
nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị. 
Ahụhụ dịrị Filistia 
 4 Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, 
obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. 
Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; 
a ga-ehopukwa Ekrọn. 
 5 Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, 
unu bụ ndị Keret; 
okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, 
Kenan, ala ndị Filistia. 
Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, 
ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.” 
 6 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, 
ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ 
na ọgba igwe ewu na atụrụ. 
 7 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri 
ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, 
ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. 
Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, 
dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. 
Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, 
mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile. 
Ahụhụ dịrị Moab na Amọn 
 8 “Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, 
na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, 
nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m 
na-anya isi na ha ga-ewere ala ha. 
 9 Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” 
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, 
bụ Chineke Izrel, kwubiri ya, 
“aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm, 
mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. 
Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, 
na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. 
Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, 
ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.” 
 10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, 
na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide 
ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 
 11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, 
mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. 
Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, 
onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. 
Ahụhụ dịrị Kush 
 12 “Unu ndị Itiopia,* 2:12 Maọbụ, Kush 
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” 
Ahụhụ dịrị Asịrịa 
 13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, 
laa Asịrịa nʼiyi. 
Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, 
ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara. 
 14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, 
ha na ihe e kere eke dị iche iche. 
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo 
ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. 
Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, 
mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, 
ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe. 
 15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, 
nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; 
nke na-asị onwe ya, 
“Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” 
Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; 
lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. 
Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, 
ma fufekwaa isi ya.