Abụ nrigo.
Toonu Onyenwe anyị
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile
ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.
2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya
ma toonu Onyenwe anyị.
3Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa
site na Zayọn gọzie unu.