3
Ihe niile nwere oge 
 1 Ihe ọbụla nwere oge; 
mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe. 
 2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, 
oge ịkụ ihe na oge ihopu, 
 3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, 
oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi, 
 4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị,* 3:4  Rom 12:15 
oge iru ụjụ na oge ite egwu, 
 5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, 
oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ, 
 6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu, 
oge ịchịkọba, na oge ichifusi, 
 7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta, 
oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,† 3:7  Ems 5:13; Ilu 25:11 
 8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, 
oge ibu agha, na oge ime udo. 
 9 Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?  10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.  11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.  12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.  13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.  14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya. 
 15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, 
ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. 
Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ. 
 16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, 
na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, 
nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya. 
 17 A gwara m onwe m, 
“Chineke ga-ekpe, 
ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, 
nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, 
oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.” 
 18 Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.  19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.  20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.  21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?” 
 22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?