4
Mmegbu, ndọgbu nʼọrụ, na enweghị enyi 
 1 Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, 
anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, 
ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, 
ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, 
ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi. 
 2 Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ, 
bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga, 
ka ndị dị ndụ mma, 
bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a. 
 3 Ma ọ dị mma karịa ha abụọ 
bụ onye ahụ a na-amụbeghị, 
onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ 
nke dị nʼokpuru anyanwụ. 
 4 Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe. 
 5 Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, 
na-eri anụ ahụ onwe ya.* 4:5  Ilu 24:30-31 
 6 Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, 
karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, 
nke bụ naanị ịchụso ifufe. 
 7 Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu. 
 8 Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, 
o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. 
Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, 
ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. 
Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” 
“nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” 
Ihe nke a enweghị isi, 
ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ. 
 9 Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, 
nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: 
 10 Otu onye nʼime ha daa, 
onye nke ọzọ ga-apalite ya. 
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, 
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. 
 11 Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, 
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? 
 12 Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, 
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. 
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa. 
Ọganihu enweghị isi 
 13 Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.  14 Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.  15 Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.  16 A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.