5
Kwụghachi nkwa ị kwere Chineke 
 1 Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ. 
 2 Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu 
maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, 
maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.* 5:2  Ilu 20:25 
Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe 
ma naanị nʼụwa ka ị nọ, 
nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole. 
 3 Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, 
otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ. 
 4 Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.  5 Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.  6 Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?  7 Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke. 
Akụnụba enweghị isi 
 8 Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha.  9 Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru. 
 10 Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. 
Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. 
Nke a bụkwa ihe efu. 
 11 Akụ na-abawanye, 
ndị na-eri ya na-abawanyekwa. 
Olee uru ha bara nye onyenwe ha 
karịa iji anya ya abụọ na-ele ha? 
 12 Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, 
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, 
ma oke iriju afọ onye ọgaranya 
anaghị ekwe ya rahụ ụra. 
 13 Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, 
mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu, 
 14 ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi 
nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, 
o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa. 
 15 Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, 
otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. 
O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile 
ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ. 
 16 Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. 
Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. 
Gịnị bụ uru ya, 
mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe? 
 17 Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị, 
site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe. 
 18 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.  19 Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.  20 Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.