7
Amamihe 
Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma. 
 2 Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ 
karịa ebe a na-eri na-aṅụ. 
Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; 
ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi. 
 3 Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, 
ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka 
 4 Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, 
ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ. 
 5 Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe 
karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ. 
 6 Ọchị onye nzuzu 
dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.‡ 7:6 Mgbe ogwu na-ere ọkụ, na-eme mkpọtụ, na-asụkwa anwụrụ, nke a adịghị eme ka ahụ ndị na anya ọkụ ya nʼoge oyi kporo ọkụ. 
Ihe a bụkwa ihe efu. 
 7 Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, 
iri ngarị na-emerụ obi mmadụ. 
 8 Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! 
Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako! 
 9 Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, 
nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu. 
 10 Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” 
Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a. 
 11 Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. 
Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya. 
 12 Amamihe bụ ndo 
dịka ego si bụrụkwa ndo, 
ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a: 
Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya. 
 13 Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. 
Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, 
bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ? 
 14 Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, 
ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma 
na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma 
makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. 
Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta 
ọdịnihu ya. 
 15 Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; 
onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, 
ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya. 
 16 Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, 
emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. 
Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị? 
 17 Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, 
abụkwala onye nzuzu! 
Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị? 
 18 Ọ dị mma ijide otu 
na-esepụghị aka na nke ọzọ, 
onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ. 
 19 Amamihe na-eme ka otu onye dị ike 
karịa mmadụ iri na-achị otu obodo. 
 20 Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, 
ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla. 
 21 Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, 
ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị. 
 22 Gị onwe gị maara 
na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ. 
 23 Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, 
“Aga m abụ onye amamihe,” 
ma nke a karịrị m. 
 24 Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; 
ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya? 
 25 A tụgharịrị uche m ka m ghọta, 
iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị 
na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume 
na ịyị ara nke dị na enweghị uche. 
 26 Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, 
ihe ahụ bụ nwanyị. 
Obi ya dị ka ụgbụ. 
Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. 
Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, 
ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya. 
 27 “Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: 
“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile. 
 28 Mgbe m ka na-achọ 
ma achọtaghị m, 
nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, 
ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha. 
 29 Achọpụtara m naanị nke a, 
Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, 
ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”