8
 1 Onye dị ka onye amamihe? 
Onye maara nkọwa ihe? 
Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe, 
na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee. 
Rubere eze isi 
 2 Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.* 8:2 Ọtụtụ oge, ndị ọchịchị na ndịisi obodo na-aṅụ iyi nʼihu ndị ọkaikpe, ndị ụkọchukwu nakwa ọha obodo, na ha ga-abụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ha. Ọ bụ ya ka a na-ekwu nʼebe.  3 Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.  4 Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme? 
 5 Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. 
Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe. 
 6 Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, 
ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya. 
 7 Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime, 
onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime? 
 8 Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ† 8:8 Maọbụ, ifufe mgbe ọ chọrọ. 
Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. 
Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, 
otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ. 
 9 Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.  10 Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu. 
 11 Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.  12 Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.  13 Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo. 
 14 Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.  15 Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ. 
 16 Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,  17 mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.