9
Ihe na-eche mmadụ niile 
 1 Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị.  2 Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja. 
Dịka ọ dịrị ezi mmadụ, 
otu a ka ọ dịrị onye mmehie; 
dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi, 
otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ. 
 3 Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.  4 Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ. 
 5 Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ, 
ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla; 
ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ, 
nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu. 
 6 Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha, 
na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ. 
Ha agaghị enwekwa oke 
nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ. 
 7 Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị.  8 Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.* 9:8 Ihe e ji maara ndị Juu nʼoge mmemme, maọbụ ụbọchị izuike, bụ iyi akwa ọcha na itekwasị mmanụ nʼisi ha.  9 Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.  10 Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga. 
 11 Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, 
ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, 
ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; 
ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, 
ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, 
ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; 
kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị. 
 12 Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru: 
Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya, 
maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ. 
Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ 
mgbe ha na-atụghị anya ya. 
Amamihe dị mkpa karịa nzuzu 
 13 Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu.  14 Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya.  15 Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya.  16 Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe. 
 17 Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ, 
karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu. 
 18 Amamihe ka ihe agha niile mma, 
ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi. 
*9:8 9:8 Ihe e ji maara ndị Juu nʼoge mmemme, maọbụ ụbọchị izuike, bụ iyi akwa ọcha na itekwasị mmanụ nʼisi ha.