11
Ịgbasapụ aka 
 1 Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye 
nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị. 
 2 Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ 
nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo. 
 3 Mgbe eluigwe rujiri, 
mmiri ga-ezo; 
mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, 
ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ. 
 4 Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, 
onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi. 
 5 Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga 
maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, 
otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, 
onye mere ihe niile. 
 6 Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, 
esepụkwala aka nʼanyasị, 
nʼihi na ị maghị nke ga-eto, 
maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, 
ha niile nwere ike too nke ọma. 
Cheta Chineke nʼokorobịa gị 
 7 Ìhè dị ụtọ, 
ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ. 
 8 Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, 
ya ṅụrịa nʼime ihe niile, 
ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị 
ga-adị ọtụtụ. 
Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu. 
 9 Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. 
Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.* 11:9  Akw 3:27 
Mee ihe niile ị chọrọ ime; 
gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. 
Kama, ghọtakwa nke a, 
na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere. 
 10 Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,† 11:10  2Tm 2:22. 
wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, 
nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.