12
 1 Ya mere, cheta Onye kere gị 
mgbe ị ka bụ okorobịa, 
tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa, 
na mgbe afọ aka abịarubeghị 
mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.” 
 2 Tupu anyanwụ na ìhè, 
ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị, 
na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri. 
 3 Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji, 
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata, 
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole, 
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị, 
 4 mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, 
mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, 
mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, 
ma abụ ha niile na-ala ala, 
 5 mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; 
na ihe egwu nke okporoụzọ, 
mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru 
mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, 
agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. 
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, 
ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile. 
 6 E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, 
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, 
tupu ite adawaa nʼisi iyi, 
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri. 
 7 Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;* 12:7  Jen 3:19; Job 34:15; Abụ 90:3 
mmụọ† 12:7  Ekl 3:21 anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. 
 8 “Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. 
“Ihe niile bụ ihe efu!” 
Nchịkọta okwu niile 
 9 Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.  10 Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu. 
 11 Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.  12 Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a. 
Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike. 
 13 Ugbu a anụla ihe ndị a niile, 
ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu: 
Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile, 
nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ. 
 14 Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, 
ya na ihe nzuzo anyị niile, 
ma ha dị mma ma ha dị njọ.