Abụ Akwa  
 1
 1 Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ 
si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu! 
Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ, 
bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile. 
Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị 
si ghọọ ohu. 
 2 Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, 
anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, 
nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, 
ọ dịghị onye na-akasị ya obi. 
Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; 
ha niile aghọọla ndị iro ya. 
 3 Juda ejeela biri nʼala ọzọ, 
mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta. 
Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche, 
ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla. 
Nʼetiti nhụju anya ya 
ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya. 
 4 Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, 
nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. 
Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, 
ndị nchụaja ya na-asụ ude, 
ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, 
ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu. 
 5 Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; 
ndị iro ya nọ nʼahụ udo. 
Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, 
nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. 
E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, 
dịka ndị a dọtara nʼagha. 
 6 Ịma mma niile 
esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. 
Ụmụ eze ya dị ka ele 
nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. 
Nʼihi adịghị ike ha, 
ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga. 
 7 Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala, 
Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie. 
Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị. 
Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya, 
o nweghị onye inyeaka ha hụrụ. 
Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ 
ya, chịa ya ọchị. 
 8 Jerusalem emehiela nke ukwu, 
nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. 
Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, 
nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. 
Ya onwe ya kwa na-asụ ude, 
ma chigharịakwa azụ. 
 9 Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. 
Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. 
Lee ka o si daa, dasie ike, 
ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. 
“Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. 
Lee ka ndị iro si merie m.” 
 10 Onye iro agbasaala aka ya 
chịkọtaa akụ ya niile. 
O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche 
si bata ebe nsọ ya. 
Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata 
bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị. 
 11 Ndị ya niile na-asụ ude 
mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. 
Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, 
ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. 
“Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, 
nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.” 
 12 “Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe? 
Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ. 
O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m, 
nke e mere ka ọ bịakwasị m, 
bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m, 
nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ? 
 13 “O si nʼelu zite ọkụ, 
e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. 
Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, 
meekwa ka m laghachi azụ. 
O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, 
onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile. 
 14 “Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;* 1:14 Maọbụ, ọ kpaala mmehie m niile dịka agbụ yoku 
jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. 
A nyakwasịla ya nʼolu m. 
Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. 
O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ 
m na-apụghị iguzogide. 
 15 “Onyenwe anyị ajụla 
ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. 
Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, 
ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. 
Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya 
ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke. 
 16 “Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. 
Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. 
O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; 
o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. 
Ụmụ m atọgbọla nʼefu, 
nʼihi na onye iro emeriela.” 
 17 Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya 
ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. 
Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb 
na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. 
Jerusalem aghọkwaala 
ihe rụrụ arụ nʼetiti ha. 
 18 “Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. 
Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. 
Geenụ ntị unu ndị niile, 
leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. 
A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha 
buru ha jee mba ọzọ. 
 19 “Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, 
ma ha ghọgburu m. 
Ndị nchụaja m na ndị okenye m 
nwụrụ nʼime obodo 
mgbe ha nọ na-achọta nri 
ha ga-eji debe onwe ha ndụ. 
 20 “Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. 
Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, 
obi m kwa enweghị izuike nʼime m 
nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. 
Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. 
Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya. 
 21 “Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, 
ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. 
Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, 
ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. 
Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, 
nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị. 
 22 “Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. 
Mesokwa ha mmeso 
dịka i si mesoo m 
nʼihi mmehie niile nke m. 
Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, 
ana m adakwa mba nʼobi m.”