2
 1 Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya 
kpuchie ada Zayọn! 
O sitela nʼeluigwe 
tụda ịma mma Izrel nʼala, 
o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, 
nʼụbọchị iwe ya. 
 2 Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb; 
na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ. 
O sitela nʼoke iwe ya 
dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. 
Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala, 
mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ. 
 3 O sitela nʼoke iwe ya 
bipụ ike niile Izrel nwere. 
O seghachiri aka nri ya, 
mgbe ndị iro ha na-abịa nso. 
O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; 
si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya. 
 4 O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya, 
dịka onye iro. 
Dịka onye iro kwa 
o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya; 
ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ, 
nʼelu ụlọ ada Zayọn. 
 5 Onyenwe anyị dị ka onye iro, 
o lomichaala Izrel. 
O lomichaala ụlọeze ya niile, 
bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. 
O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa 
mụbaara ada Juda. 
 6 O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; 
o bibiela ebe nzukọ ya niile. 
Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ 
ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. 
Site nʼoke iwe ya, 
ọ jụla eze na onye nchụaja. 
 7 Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya 
gbakụta ebe nsọ ya azụ. 
O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya 
nyefee nʼaka onye iro; 
ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị 
dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka. 
 8  Onyenwe anyị ekpebiela ibibi 
mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. 
O setịpụrụ ihe ọtụtụ; 
o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. 
O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, 
meekwa ka ha richapụsịa. 
 9 Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; 
ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. 
A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. 
Iwu adịghịkwa, 
otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ 
site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 
 10 Ndị okenye ada Zayọn 
nọ ọdụ nʼala, dere duu. 
Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; 
ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. 
Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke 
ehulatala isi ha nʼala. 
 11 Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, 
ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. 
Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, 
nʼihi na e bibiela ndị m, 
nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba 
nʼokporoụzọ nke obodo. 
 12 Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, 
“Olee ebe ọka na mmanya dị?”* 2:12 Achịcha na ihe ọṅụṅụ dị 
Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ 
nʼokporoụzọ obodo, 
mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha 
nʼaka nne ha ku ha. 
 13 Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? 
Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, 
gị ada Jerusalem? 
Gịnị ka m ga-asị na i yiri, 
nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, 
gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? 
Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. 
Onye pụrụ ịgwọ gị? 
 14 Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ 
bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. 
Ha ekpugheghị mmehie gị, 
igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. 
Kama ihe ha hụtaara gị 
bụ ihe ụgha na nduhie. 
 15 Ndị niile si nʼebe ị nọ 
na-agafe na-akụrụ gị aka ha; 
ha na-efufe isi ha, 
jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. 
Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ 
a na-akpọ ebe mabigara mma oke, 
ọṅụ nke ụwa niile?” 
 16 Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha 
megide gị; 
ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. 
Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. 
Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. 
Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” 
 17  Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. 
O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime 
site nʼoge gara aga. 
Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. 
O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; 
o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. 
 18 Obi ndị mmadụ 
na-etiku Onyenwe anyị. 
Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, 
ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri 
ehihie na abalị niile, 
enyekwala onwe gị izuike, 
enyekwala anya gị izuike. 
 19 Bilie, kwaa akwa nʼabalị, 
nʼoge mmalite nche abalị. 
Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị 
dịka ọ bụ mmiri. 
Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị 
nʼihi ụmụntakịrị ndị a, 
ndị na-ada nʼihi agụụ 
nʼisi okporoụzọ niile. 
 20 “Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. 
Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? 
O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, 
bụ ụmụ nke ha mụrụ? 
O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma 
nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị? 
 21 “Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, 
nʼuzuzu nke okporoụzọ. 
E jirila mma agha gbuo 
ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. 
I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; 
i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha. 
 22 “Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, 
otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. 
Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị 
ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; 
ndị m lekọtara, zụlitekwa 
ka ndị iro m lara nʼiyi.”