4
 1 Lee ka ọlaedo si chuo echu. 
Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. 
Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ 
ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile. 
 2 Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, 
ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, 
si dịrị ugbu a dịka ite aja 
nke ọkpụ ite kpụrụ. 
 3 Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha 
azụ ụmụ ha, 
ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; 
ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara. 
 4 Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya 
nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. 
Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, 
ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ. 
 5 Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche 
tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. 
Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie 
nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 
 6 Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu 
karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. 
Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. 
Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 
 7 Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, 
ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. 
Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; 
ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 
 8 Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. 
A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. 
Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; 
ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 
 9 Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma 
karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, 
ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ 
nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi. 
 10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere 
ji gbuo ụmụ ha, sie ha. 
Ụmụ ha ghọọrọ ha nri 
nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi. 
 11  Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; 
ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. 
O sunyela ọkụ na Zayọn, 
nke rechapụrụ ntọala ya niile. 
 12 Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; 
otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị 
na ndị iro nwere ike 
si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem. 
 13 Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, 
na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, 
ndị wụsiri ọbara 
ndị ezi omume nọ nʼetiti ya. 
 14 Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, 
dịka ndị kpuru ìsì. 
Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. 
O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka. 
 15 Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! 
Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” 
Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, 
ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, 
“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.” 
 16  Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. 
Ọ gaghị agụnyekwa ha. 
Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, 
ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara. 
 17 Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, 
ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. 
Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya 
maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị. 
 18 Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, 
nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. 
Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, 
tupu ọgwụgwụ anyị eruo. 
 19 Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike 
karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. 
Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, 
nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị. 
 20 Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, 
ka ha jidere nʼọnya ha. 
Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, 
nʼetiti mba dị iche iche. 
 21 Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, 
onye nke bi nʼala Uz. 
Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. 
Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ. 
 22 Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; 
Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. 
Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, 
kpugheekwa ajọ omume gị niile.