5
 1  Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; 
leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị. 
 2 E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, 
werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ. 
 3 Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. 
Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ. 
 4 Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. 
Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ. 
 5 Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, 
ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike. 
 6 Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka 
nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị. 
 7 Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. 
Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha. 
 8 Ndị bụ ohu na-achị anyị. 
Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha. 
 9 Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, 
nʼihi mma agha nke dị nʼọzara. 
 10 Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,* 5:10 Ite ọkụ a, bụ nke eji eghe ihe dịka achịcha maọbụ amịkpọ anụ na ihe ndị ọzọ 
na-amakwa jijiji nʼihi agụụ. 
 11 Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, 
ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda. 
 12 Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; 
a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ. 
 13 Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, 
ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ. 
 14 Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, 
ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha. 
 15 Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; 
ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ. 
 16 Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. 
Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela. 
 17 Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, 
nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị. 
 18 Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu, 
nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị. 
 19 Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. 
Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 
 20 Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? 
Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile? 
 21 Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa; 
gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie, 
 22 ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam 
na-eweso anyị iwe nke ukwu.