2
Ịba uru nke amamihe 
 1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile 
zobekwa iwu m niile nʼime obi gị, 
 2 tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, 
wepụta obi gị inwe nghọta. 
 3 E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, 
ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị, 
 4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha 
maọbụ akụ nke zoro ezo, 
 5 mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị 
chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke. 
 6 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; 
nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.* 2:6  1Ez 3:9,12; Job 32:8; Jem 1:5. 
 7 Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, 
ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. 
 8 Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, 
na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. 
 9 Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi 
na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. 
 10 Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, 
ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. 
 11 Izuzu zuruoke ga-echebe gị, 
nghọta ga na-eche gị nche. 
 12 Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, 
sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ, 
 13 ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke 
na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị, 
 14 ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, 
nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ. 
 15 Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, 
jọọkwa njọ. 
 16 Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, 
na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu. 
 17 Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, 
nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke. 
 18 Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ 
nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. 
 19 Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. 
Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ. 
 20 Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, 
debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume, 
 21 nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, 
ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya. 
 22 Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, 
ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.