3
Amamihe na-eweta ahụ ike 
 1 Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. 
Ma debe iwu m nʼobi gị. 
 2 Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, 
wetakwara gị udo na ọganihu. 
 3 Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, 
kekwasị ha nʼolu gị, 
deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.* 3:3 Ịsụgharị ya nʼụzọ ọzọ ga-abụ, deekwa ha nʼime obi gị 7:3; 2Kọ 3:3 
 4 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha 
nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. 
 5 Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, 
adaberekwala na nghọta gị. 
 6 Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, 
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. 
 7 A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. 
Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. 
 8 Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike 
gbaakwa ọkpụkpụ gị ume. 
 9 Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, 
na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. 
 10 Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, 
ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ. 
 11 Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, 
ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. 
 12 Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, 
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. 
 13 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, 
onye nwetara nghọta. 
 14 Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, 
ọ bakwara uru karịa ọlaedo. 
 15 Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, 
ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. 
 16 Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; 
nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. 
 17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma 
bụrụkwa ụzọ udo. 
 18 Amamihe bụ osisi nke ndụ† 3:18  Jen 2:9; Ilu 11:30; Ilu 15:4; Mkp 2:7 nye ndị na-ejide ya aka, 
e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma. 
 19 Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; 
ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. 
 20 Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, 
igwe ojii na-atụdakwa igirigi. 
 21 Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: 
amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, 
 22 nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, 
ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. 
 23 Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu 
maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. 
 24 Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, 
ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ. 
 25 Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla 
maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. 
 26 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, 
ọ ga-echebekwa gị. 
 27 Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ 
mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.‡ 3:27  Gal 6:10. 
 28 A sịkwala onye agbataobi gị laa, 
bịaghachi azụ echi 
mgbe i nwere ike ime ya taa. 
 29 Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, 
nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. 
 30 Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, 
mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. 
 31 Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo 
maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. 
 32 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, 
ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma. 
 33 Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, 
ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume. 
 34 Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, 
ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.§ 3:34  Jem 4:6; 1Pt 5:5 
 35 Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, 
ma ndị nzuzu na-enweta ihere.